Igbo Proverbs

PROVERBS (Ilu or Ilulu)
Igbo proverbs are expressions of the experiences of the people. In order to understand Igbo proverbs, one needs to have an understanding of Igbo language, the culture and the environment. Igbo proverbs permeate all aspect of life: family, marriage, bravery, love, patience, self control, gratefulness, peace, satisfaction, gratitude, problems, difficulties, common sense and others.


Proverbs are highly prevalent in Igbo language. Ilu bụ mmanụ ndị igbo ji eri okwu. Proverbs are used to lubricate spoken words. The same proverb can be used in a variety of different situations with different meanings. Ụka bụ nka, spoken word is an art. The ability to use a suitable proverb shows the mastery of the art. Igbo proverbs are very flexible, allowing the speaker to substitute certain words to lighten or deepen the proverb. This mastery could be heard in how the speaker introduced the proverb. For instance, the speaker could say a sị (it is said that), nna m sị (my father said), m wee na-ajụ sị (and I ask), otu nwoke sị (one man said), onye ara ka a jụrụ sị (a mad man was asked), mbe sị (the tortoise said), nwaanyị orie Umuduru sị (the market woman said). The proverb as a whole can come in the form of a rhetoric question; Olee anụ nụ sị nne ya nwụọ ya were ọnụ tụnuo osisi niile? What's that animal that said she will chop down all the trees in her village the day her mother dies? Oke ọ ga-esonụ ngwere maa mmiri? Will the rat play in the rain with the lizard?


The proverbs on this website
The proverbs have been written in various dialects of Igbo language, to retain their individual strengths. To interpret a proverb, one must know the context in which it was used, but this website will attempt to provide a general discussion on the proverbs. The proverbs on this website is work-in-progress, so we will update them from time to time.

A baa nshị a rịhị
A chikọwa okwute, ọ ghọọ arushi
A chọkata ihe a ga-agwa nwa mara mma a sị ya jee kuru mmiri saa hụ
A chọwa ahụ, anaghị akọ n'akpa dibịa
A chọwa igbu nwa mkpi na-ezo mma, ndụ nwa mkpi ana-eto ogologo
A chọwa mma ekwu, e kwuo ihe eriri n'abalị
A chọwa ijide oke ehi, a chọwa oke mmadụ
A chụkata mmadu, a chụnye ya n'ụwa ọma
A chụọ aja ahụghi udele amara na ihe mere n'ala ndị mmụọ
A chụọ eghu n'ubi, ọ gbalaa n'ọba
A chụpụchaa ufu, a jụọ ọkụkọ ebe ọ gara
A gaghị asị maka na ihe ọjọọ gbara afọ kpọọ ya omenala
A gaghị egbu dibịa makana onye ọ na-agwọ nwụrụ
A gaghị eji na ọkọ kọrọ wee kọpia anya
A gaghị ekworo mgbagbu ghara ọgụ
A gaghị m eji maka agụọ sị na ishi ede ka ishi nne m mma
A gaghị m eji ụjọ daara enwe elu
A gaghị m ekworo na nna m lọọrọ m ụwa nyegbue ya na nri
A gba nshị nkịtị ọ na-eshi
A gbaa mbụ ọ tụọ n'ogwe, agba abụọ ọ tụọ n'ogwe, ọ bụzi ogwe ka a pịara akụ?
A gbacha egwu, ọ laa n'ukwu
A gbachaa ọsọ, agụọ mile
A gbakarịa izu onye ntị ike anụ ya
A gbakọlọta ọnụ nyụọ mamiri ọ gbaa ụfụfụ
A gbakọọ ka aha eri udele, a tọtuo ngịga
A gbakwaa nwa nnụnụ, nne ya efelaga
A gbakwo dike izu, a gba ya ugboro abụọ
A gbara aka na-azọ ala, onye ji ji a na-akọ ji
A ghara ndụ kpaa akụ, onye iro erie ya
A ghara otu onye, ụwa ya anyịgbuo ya
A gọwa ọfọ ebighi ebi, nti echie ndi mmụọ
A gụọ nwatakịrị aha, ọ dị ka e chiri ya echichi
A gwa ntị ma ntị anụghị, egburu isi ntị esoro ya
A gwa ogbenye ihe eji aba ogaranya, ya sị ịda ogbenye kaara ya mma
A gwọchagodi onye ara, anaghị agwọta ya ntakwu
A hapụ ike nyụrụ ahụrụ ekee isi ọkpọ
A hụ dimkpa, ahụ ogologo imi ya
A hụ ekwughi na-egbu okenye, e kwuo anụghị na-egbu nwata
A hụ ihe ka ubi e ree ọba
A hụghị ego lụnye ọkpara nwaanyị ụmụ nwaanyị niile di ime a na-mụ nwoke nwoke
A hụghị ka e mere, e mee ka a hụrụ
A hụghị n'anya a para n'aka
A hụsie ọgọ, anazighị asi ya were oche
A jụghị ajụ eri na-ebute arịaghị arịa anwụ
A jụghị m ma akpọwara m akpọwa ka m na-ere ere
A kọọ n'anwu, e rie na ndụ
A kọruo e geruo
A kpaa akpaa a rahụọ n'ute
A kpọọ nwa nkịta oku, uche ya gbalaa na nshị
A kubie egwu, onye ntị ike ana-agba
A kụla ọgwụ, ọ bụ ma ajụ?
A kwaa aja a hụ ọgụ
A kwakata dike aka n'obi, a kwanye ya ụjọ
A kwụrụ ọtọ gwujie ji, ehulọta gwuputa ọdụ ya
A lụnye gi nwaanyị, akpọnye gi ute
A lụta agbọghọ, a chụpụ agadị
A ma na akwụkwọ juru ọhịa, ma a baa ọhịa achọwa ọkazị
A ma ụma adara ọchị, ọchị anaghị akwatu mmadụ
A maghị uche onye e ji n'ala, a hapụ ya ọ ga alụ ọgụ, a hapụ ya ọ ga agbalaga?
A na-achi ọkụ aracha aka, a ga-ekonye ya n'uko
A na-adụ nwa nwere nne ọdụ nke na enweghi nne na-egere
A na-adụ onye oshi ji ọdụ, ya were obi na-apịa mbazụ
A na-aga egwu ọnwa ka ahụ mmadụ ọ bụghị ka ahụ ọnwa, maka ọnwa na-eti n'ụlọ onye ọbụla
A na-aga mba ka amụta ihe ọ bụghị ka e rijue afọ
A na-agba afa na agụọ, ọ na-ada ọnwụ ọnwụ
A na-agwa odo anya anaghị etinye ya ose
A na-agwọ ya ibi ya na-eto afọ
A na-ama atụ otule, ọ dịka ọ nọ n'oru
A na-ama ọkwa mmiri maka ozuzo ya
A na-anọ be onye ụjọ atụ aka be dike
A na-atụ nwaanyị ike ukwu ụjọ, ọ bụ ya ga-arigo onwe ya?
A na-egbochi ideyi, ọ na awa
A na-egbu ebila ihu anaghị adị atụrụ mma
A na-egbu achara ọ na-eto
A na-egwu egwu na ebisa aka na ikpu, ndị nwụrụ anwụ a na-alọ ụwa
A na-eji nwayọ akọ ụkọ n'iku anya
A na-ekwu na ọkụkọ bu nshị na okpa, o jiri ọnụ tụrụ ya
A na-ekwu na ọrịa ezughị oke, ndị dara ibi na-eto afọ
A na-ekwu n'ụkọ gbara Father, ị na-ajụ ma ọ gbakwara ahụ ọnụ ya
A na-eme ọna a na-eme ọnammiri
A na-emere agbọghọ, ya na-emere onye dị ya mma
A na-esi na nwata amara nwa ga-egburu nna ya ehi
A na-esi n'ụlọ mara mma pụọ ama
A naghị achịnye aka abụọ na ọnụ
A naghị achọ ihe na-akpa onye na-achọ ihe
A naghị achọ nwa eze achọ n'ọgbọ ọha
A naghi agba aka ahụ nwata eze
A naghị agba aka arị ọjị
A naghi agba ụria aka hapụ isi aka
A naghị agbara nshị nọ n'afọ asụ
A naghị agwa diochi na ọrụ di na ngwọ
A naghị agwa onye isi na nnu adịghị n’ofe
A naghi agwa oshi ntị na ahịa esula
A naghi ahapụ ebe ana-echi ọzọ jebe ebe a na arụ agwụ
A naghị ahapụ isiaka were agba ụrịọm
A naghị ahụcha ụzọ sị mụta okụ
A naghị ajụ nri ekpusiri ekpusi
A naghị ajụ efere na nkwuchi
A naghị ajụ okokporo ebe ọ rahụrụ ụra na abalị, ihe ka mkpa bụ ma ọ lọtarakwara
A naghị akpụ mmiri n'ọnụ afụ okụ
A naghị akwọ aka etiri ọkụkọ akị
A naghị amụ aka ekpe na nka
A naghị anọ n'ihu ọgụ apị akụ
A naghị anọ ofu ebe ekiri mmanwụ
A naghị anụ isi ndi mmụọ ghewe ọnụ oghe
A naghị asi agadị nwaanyị mechikụlọta ụkwụ, a maghị ebe o si eku ume
A naghị asị okenye pụta n'anwụ
A naghị ata okpụkpụ nshịkọ na nzuzo
A naghị ebi ikpe n'otu olu
A naghi ebute ụkwa n'osisi ụkpaka
A naghi edinye nwata mụta ọkụ, hakwasị ya mmiri
A naghi edinye nwata ozi nnụ, hakwasị ya mmiri
A naghi edu ewu eje n'ọba
A naghị eji abalị arọ anya
A naghị eji anya nchakasị aga na nke atanị, maka atanị bụ anya anya
A naghị eji ihe ana-agba na ntị agba n'anya
A naghị eji ihere elo anwa
A naghị ekpuchi afọ ime aka
A naghị enwecha nkwa, na-akwa aka n'ume
A naghị enye nkịta ọkpụkpọ sị ya chebe
A naghị ere ọkụkọ ụkwụ mkpirisi na nso
A naghị eti nwata ihe nara ya akwa
A naghị eti nwata ihe ụbọchị ọ wụfuru mmanụ ka ma ọ bụ ụbọchị ọ wụfuru ogiri akwụ
A naghị m eti mmọnwụ a na-akwa aka
A nara ofu onye oru azụ, a narago ibe ya
A nazịghị m agba ka m data ego
A nọdị mmadụ mmadụ a na-ekwu mmụọ mmụọ
A nọgide anọgharịa
A nọrọ n'elu nyụọ ahụrụ, ọgba ijiji gharịị
A nụkata na-amụrụ nwoke a nụwa na-amụrụ nwaanyị
A nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gba ụfụfụ
A nyụọ nshị akapịghị ọnụ, ọ bụrụ otoro
A rụọ n'anwụ, e rie na ndụ
A sị onye ohi nwude ọkụkọ ọ si na ọ ga-atagbu ya
A sị nwata kpọọ onye ọma, ọ kpọọ enyi nne ya
A sọgide eze, ekpuru nkata gwa ya okwu
A tatụ ụkwa a tatụ akị
A tụfuo ihe e ji ama mma, mma arụọ
A tụfuo nkịrịnka nkata, ubọchị a ga achụ aja ruo, a chọwa ya
A tụọ ilu nkịrịnka nkata, ihu agbajọọ onye tara ahụ
A tụọrọ ọ mara ọ mara, a tụọrọ ofeke o fenye isi n'ọhịa
A tụpụ nwa nkịta igwi, egosi ya, ka ọ ghara iche na ị tụrụ ya mbọ
A tụrụ ilu ka ọ gba ofeke gharịị
A tụwa agwa ahụrụ a baa nshị
A zọta ndu, edebere ọnwụ
Abụzụ maara ihe o mere gbachie ụpụ gbachie isi ọnụ
Achọgide ebe a ga ebido aka, ebido n'ikpere
Afọ ekweghi ụkwụ zuo ike
Afọ ọma ya na akpụ n'ala
Afọ Umuduru amaghị na ofu onye abiaghị ahịa
Agadi nwaanyị anaghị aka nka n'egwu ọ ma agba
Agadi nwaanyị daa ada ugboro abụọ, ọ gụọ ihe o bu n'ísi ọnụ
Agadi nwaanyị e kunyere nwa, ọ sị ya enwezighi eze, a sọ ya tagbuo ya atagbu
Agadi nwaanyị na-eche ka ọ ga-esi ri inine, inine a na-eche ka ọga-esi saa nwaanyị afọ
Agadi nwere onye na-elekọta ya, sị na agbụrụ ya anaghị aka nka
Agaghị m aba n'ọba e kere ede
Agbara na-agba ọsọ aja, na-eri ewu ọjọọ
Agbarụọ ngele e kuru ṅụọ
Agbataobi onye bụ nwanne ya
Agbịsị gbaa otele ọ mụrụ akọ
Agbọghọbịa tochaa o chere ibe ya
Agbụrụ na-eri ekpe anaghị agwọ onye ọrịa
Agbụsị gbaa otele ọ mụrụ akọ
Agha akara aka anaghị eri ngwọrọ
Agụ bata mgbada awara ọsọ
Agụọ gburu ogaranya nwete ogbenye ọ dọrie ya
Agụọ nwere olile anya anaghị egbu egbu
Agwa ka mma ma eke tụa ya
Agwọ aghaghị imu ihe nwere ọdụ ogologo
Agwọ dị n'akịrịka
Agwọ emeghị ihe o ji bụrụ agwọ ụmụ aka ewere ya kee nkụ
Agwọ loro ibe ya na-enwe ọdụ abụọ
Agwọ otu onye hụrụ na-aghọ eke
Agwọ sị onye aka ya na-ekotereghi ụkwụ ya ekotere ya
Agwọ tụrụ mbe, tụrụ okpokoro
Aha m anaghị adị mma na mkporohihi
Ahịa dị mma na-ere onwe
Ahịa mbe na mbe na-azụ uru anaghị adị na ya
Ahịa ọma na-ere onwe ya
Ahịa onye na-azụ ka ọma anya ya
Ahịa zụchaa a nụ ụda ya
Ahụghị ka e mere emee ka ahụrụ
Ahụrụ anyụrụ n'elu gbara ijiji gharị
Ahụshie ọgọ a nazịghị asị ya were oche
Ajọ ọnọdụ butere ile ajọ anya
Ajọ nwa siri owere baa nne ya afọ
Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ
Aka gbajie igwe ụjọ atụọ osisi
Aka na-eme azụ gbaa nkụrụkụ
Aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe a kwọọ aka nri
Aka ọmụmụ anaghị egbu nwa
Aka ruru akpa, eru go ọnụ
Aka wete aka wete, o ju ọnụ
Akịdị anaghị ama oke ala
Ako bụ ndụ
Akpaa akpa, arụhụo n'ute
Akpaa n'anwụ e rie na ndụ
Akụ dịka mmiri nọ n'ikwe, o ruga ebe a, o ruga ebe a
Akụ ferechaa ọ daara nwa awọ
Akụ rue ụlọ a mara onye kpara ya
Akụkọ a bụ oghere ji egheghi ede
Akwa ọhụrụ na-apụ maamiri
Akwa ọkụkọ tie akị, ihere emee nkume
Akwụ rere ere na ikwe mpu
Ala adịghị mma bụ uru ndi nze
Amụ na-anwụchụghị anwụchi ga-eri anụ gbara aji
Anụ gbaa ajọ ọsọ, a gbaa ya ajọ egbe
Aṅụ gọọ, ebu gọọ, gịnị gbakpọkwaranụ nwa nkịta m anya
Anụ laa taa echi bụ nta
Anụ mbu ụzọ na-aṅụ mmiri ọma
Anụ soro enwe o majie ụkwụ
Anụ tagburu nkịta na-ata ajọ arụ
Aṅụla ngwọ na nkwụ na-abịa
Anya bewe, imi ebewe
Anya ka e ji ama ọka chara acha
Anya m hụrụ gị akpọla m
Anya hụrụ ugo jaa ya mma maka na a naghị ahụ ugo kwa daa
Anyị ga-ama mbe naabụ nke bụ oke
Ariri azọrọ ụkwụ ebeghi akwa, ọ bụrụ onye zọrọ ya ụkwụ na-ebe akwa
Arụ gbaa afọ, o buru omenaala
Arụsị kpakarịa ike, e gosi ya osisi e jiri pịa ya
Ashịrị gụwa ogoli o bulie eju ọkụ
Atụrụ mụrụ ebịla gba aka nwa
Atụrụ na-anyụre ọdụ ya, o chee na ọ na-emegide onye nwe ya
Atụrụ sị na a kụrụ egwu ruo na be ya, ọ bụrụ na ọ maghị agba, ọ wụliwe elu
Awọ anaghị agba ọsọ ehihie na nkịtị
Awọ sị awọ ibe ya wọmkọm
Azụ a mara ọkwa ya ọ dịghị mma oke ịta ya
Azụ na-eloghi ibe ya anaghị ebu
Beta anụ , beta anụ , ọ kwa n'ahụ nama
Burukwa ọkụkọ ụzọ lakpuo ụra
Chi bọọ a nụ ọzọ
Chi nyere nwa ogbenye ji ga-enye ya mbazụ ọ ga-eji egwuru ya
Chinchi sị ụmụ ya ihe dị ọkụ ga jụ oyi
Chọwa akwa gi ebe ị sara ahụ
Dibịa na-agwọ otoro, o dewere ike ya n'uko?
Dike taa akị, ahụ ikikere ya
Dinta agaghị asi maka oke nkịta jideere ya anụ kpọọ ya di nne ya
Diochi anaghị ekwucha ihe niile ọ hụrụ n'elu nkwụ
Dupu m bụ ure, o nweghi onye lawara nụ ma ghara ilarụ
E buru ozu onye ọzọ, ọ dịka ebu ukwu nkụ
E che nti n’ala, a nụ ụda ụkwụ agbụsi
E gboo ọgụ, onye ụjọ a na-aba
E gbugodiri egbe ehi, anya ya ka ga-adịkwa na nwa shiishii
E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, e rue n'ọgụ ama achọwa dike
E gbuo ma iwe, e lie ma isi
E gupee ụzọ, e gupee ọnụ
E ji anya ama ọka kara aka
E ji isi ahụrụ ama ụtọ nsi
E ji okwe eri okwe
E jide dike n'ala ma e kwotaghị ya mma, ọ bụzi mgbe o biliri ọtọ
E jide ibe ji n’aka e were kọwa akụkọ maka ụganị
E jidebeghi egbe, a na-ekwu na nwaanyị agaghị eri ya
E jighi abalị arọ anya
E jighi akpata atụfuo aba ọgaranya
E jighi anya ọma aba ụka ekpere
E jighi enyo ele ihe agba n'aka
E jighi igbo agwa ya onye ọcha
E jighi ihe a na-agba na ntị agba n'anya
E jighi ihere elo anwa
E jighi ike arahụ ụra
E jighi ụtụtụ ama njọ ahịa
E jiri nkịta ejighi ọgbụ
E kee oke n'aka n'aka, amara onye akpọrọ ashị
E kele mmanwụ, ekele ụmụ nkwụ ya
E kuru nwa nkịta na ahụ, ọ takaa ọgọdọ
E kwe ekele, ihu saa
E kwe onye ekpenta n'aka, ibi ọma agụwa ya
E kweghi ekwe na-ekwe n'ute ekwere
E lelịa nwa ite, ọ gbọnyụọ ọkụ
E lewe okenye anya n'ọnụ, ọ dị ka ọ ṅụghị ara nne ya
E lewe osisi kpọrọ nkụ, nke dị ndụ a bụrụ daa
E lewe ukwu, egbuo eghu
E liwe ụzọ liwe ehi, ma tọrọ ụzọ ghara ehi
E mee e megwara anaghị agba anya mmiri
E mee ngwa ngwa e meghara ọdachi
E mee nwata ka e mere ibe ya, obi adị ya mma
E mee ya allow, ọ chọwa allowance
E menyere nwa ogwugwu, e menyere nwa anosike
E nweghi okwu esewe esewe
E nye nwata ihe ọ na-atụbaghị anya ya, ọ jụọ sị a sị ya nye onye
E nyejue dibịa afọ, ọkpara ahịhịa ọgwụ n'ajọ ọhịa
E si n’ushi ahụrụ ama ụtọ nshị
E siwe egheghi eghe, anyị nọ n'alaghị ala
E siwe nwa ite n'okụ, nwa mgbei ejegbuo onwe ya n'ozi
E tere ụgba etere azụ
E tie dike n'ala, a nụ ụzụ ya
E too dike na nke omere omekwa ozo
E too nwaanyị gwọtara ndudu, ọ gwọta ọzọ
E were aka nri tie nwata ihe e were aka ekpe kpọkete ya
E were ụtụtụ kụta mmiri ụgụrụ ọ dị ka agaghị aṅụ ya aṅụ
E zue ka aha eri udele atọtuo ngịga
Ebe aka ruru nwaanyị ka ọ na-ekonye akpa ya
Ebe aka ruru ogoli, ka ọ na-tụkwasị di ya
Ebe ala dị nso anaghị eshi agụgọ mgba
Ebe ndị isi abụọ na-eriko nri, naani chi ha ma onye gwọrọ ofe
Ebe nwanza na-eriju afo ka a na-ebuta ozu ya
Ebe nwata na-ebute ejula ka a na-ebute okpokoro isi ya
Ebe nwata na-ebute ozu nchi ka a na-ebute okpokoro isi ya
Ebe nwata na-atụtụta aki okpokoro ka ọ na-aga
Ebe nwata na-ebe akwa arụ aka, nne ya anọghi ya nna ya anọrọ ya
Ebe nwata na-ebuta ọnụ mmanụ ka ọ na-apụ ọrịrị
Ebe ọkụ gbara mbe ji okwute kwara akwa, ọ bụzi ọkụkọ bu ukwu abụba ka ọ ga-ahapụ?
Ebe ọkụ nyụrụ awusa ọwa
Ebe onye bi ka ọ na-awachi
Ebe onye dara ka chi ya kwaturu ya
Ebe onye ọsọ ruru ka onye ije ga-eru
Ebe osisi kpọhuru ka ọ na-ada
Ebube agụ na-eche agụ
Echi di ime
Egbe bere ugo bere, nke sị ibe ya ebela, nku kwaa ya
Egbe eberego na mgbagbu
Egbe gbuo nku a mara ebe ọ ga-ebe
Egbe na ọkụkọ anaghị azụkọ ofu ahịa
Egbe na udele anaghị azọ nri
Egbe nkanka nku abuzịghị nwa egbe
Egbelegbe daruo ala, nwaanyị arịa ya elu
Eghu nwụrụ n'ọba ji awụụ agụọ gburu ya
Ego bụ mma dị nkọ
Ego dị n'ogwu
Egwu anaghị atụ afọ, o buru ụzọ
Egwu dara n'ihu azị ka azị na-ete
Egwu ebidobeghi, mgbada agbajigo ukwu rịị
Egwuru egwu nwa nkịta na nwa nkịta bụ onye daara ibe ya ibe ya daara ya
Ehi na-enweghi ọdụ, chi ya na-achụrụ ijiji
Eje alọ bụ isi ije
Ejula na-ere ọkụ, sị na ya na-agbanyụ ọkụ
Ekele ụgụrụ a na-ekwe ya na akụkụ ọkụ
Ekpere niile biri n'Amen
Ekwe ekele, ihu asaa
Ekwe kụọ, ama agbaa
Ekweghị ekweghị na-ekwe n'ụta ekwere
Elelịa nwa ite ya gbunyụọ ọkụ
Eneke ntị oba si kamgbe dinta mutara ịgba ehieghi ehie, ya muta ife ebenyeghi ebenye
Enwe kwọ nwa ya n'azụ ya ghọrọ ụtụ na-ara
Eriri ma ngwugwu, ngwugwu ma onye kere ya
Etu ọ sọrọ arusị pee mpe, aka abụọ ka eji ebu ya
Ewu ataala m igu n'isi
Ewu makpu amakpu makpugodoro ọkpụkpọ ya
Ewu na ọshishiọ na-eme, kama ajị ekweghi ya
Ewu na-ata agbara, nwa ya ana-ele ya anya n'ọnụ
Ewu nnụ mmadụ na-akwara nri, agụrụ na-egbu ya
Ewu nnụ mmadu na-akwatara iri na-anwụ n'agụọ
Ewu nwa ogbenye bụ ehi ya
Ewu nwụrụ n'oba ji abụghị agụrụ gburu ya
Eze onye agwala m bu nshị n'ọgọdọ akpagharị
Ezigbo ọkọchị na-eweta ezigbo udu mmiri
Ezigbo okwu enweghi osịsa
Eziokwu bụ ndụ
Father sụrụjuo Latin, ebe anyị chere ya bụ n' Amen
Gaa chịrị akwa gị ebe ị sara ahụ
Gbaa m ụkwụ n'eze
Gị na onye na-aghịnye aka n'ike esi n'imi
Gidigidi bụ ugwu eze
Gịnị jikwanụ nwa nkịta ọnwụ?
Ha nwere ebu nwee mfụ
Hapu ihe e dere na motor banye motor
Hapu ihe niile bere n'abalị ka ọ bụrụ anwụnta
Hie asaa n'anya
Ị ga abụ ogbenye bụrụ amụsu
I ji mma jiri ibe ji, onye ị waranyere ya rie
Ị jụta ishi nkịta, I were agba ya mee gịnị?
Ị na achụpụ nwa nkịta na nshi, ị ga eri ya?
Ị na-achị m ọchị, eyi m azụ efe?
Ị na-emezi ka mmụọ nsọ abụrọ Chukwu
Ị nọdị ala na-agụ ngwere ma ọdụ ekweghi ya
Ị nọ na mmiri, ncha abaa gị anya
I zie m ozi zie ogaranya, aga m ezi ya, mana ị sị gbaa ajụ bute ya, agaghị m ekwe
Ibu a dị mmadụ abụọ buru, ọ dịrị onye ihu mma ọ naghị adịrị onye bu n'azụ
Ibu anyị danda
Ịgba dagharịa, egwu dagharịa
Igwe ejee ngaa
Ihe a kpachatara n'akụkụ ite na-ala n'akụkụ ọnụ
Ihe a na-achọ n'uko elu ka ahụrụ n'uko ala
Ihe agụ ji eme ire dị ya na mbọ
Ihe agwọ mụrụ aghaghị ito ogologo
Ihe akọ n'obi ọgaranya
Ihe amụrụ amụ ka ihe agwọrọ agwọ
Ihe awọrọ ogoli azụa n'ahịa
Ihe dabara na mmiri, ụkwụ ka eji achọ ya
Ihe dị be oke dị be ọgịnị
Ihe dị mma na anya gbara ndụ
Ihe ahụ di wọrọ ogori azụọla n’ahịa
Ihe dibịa jiri kara ibe iwe bụ na mkpa akwụkwọ
Ihe e ji eli ozu na-atọ ofeke ụtọ, ma ya rịachaa ya bilite
Ihe egbe mụrụ aghaghị ibu ọkụkọ
Ihe ehi hụrụ gbaa ọsọ, ka ọkụkọ hụrụ na-atụ ọnụ
Ihe ju akpa e kechie ya ọnụ
Ihe ka nte bakwutere nte n'ọnụ
Ihe kwụrụ, ihe akwụdebe ya
Ihe na-agụ nwaanyị dị ime na-agụkwa onye tụbara ya
Ihe na-ato ụtọ na-egbu egbu
Ihe na-atọ ụtọ na-egbu egbu
Ihe nkịta hụrụ gbọwa ụja, atụrụ a hụla kemgbe gba nkịtị
Ihe nwoke nyere ibe ya bụ ngaa jidere m
Ihe ofeke hụrụ bụ ihe ọkụkọ chị ụmụ hụrụ
Ihe okenye nọdịrị ala hụ, nwata kwụrụ ọtọ ọ gaghị ahụ ya
Ihe ọkụkọ ma mmiri achụ dị ya mkpa
Ihe onye kpọrọ nkịta ya ka ọ na-aza
Ihe onye na-amaghi anaghị egbu ya
Ihe onye na-eme ka ekwe na-akpọ ya
Ihe ọsọrọ afọ saa ehi, ọ gaghị aha ka ewu
Ihe tagburu nkịta na-ata ajọ arụ
Ihe udele kwere ozu
Ihu ama ama na-anyụ mma
Ihu dị mma adịghị mma ịtụ mbọ
Ihu dike na-anyụ mma
Ije maa mma e jee ya nje naabụ
Ijiji berenyere na akpa amụ, ị hapụ ya ọ na-ata akpa amụ, ị kụa ya,  ị kụpịa mkpụrụ amụ
Ijiji na-enweghị onye ndụmọdụ na-eso ozu aba n’ili
Ijiji enweghị onye ndụmọdụ na-eso ozu aba n’ili
Ike gwụ agadị, ndịda abụrụ ya ugwu
Ike ọrụ gwụ nwata, ike ọgụ kara ya mma
Iko ya ejugo
Ikpe mara eziokwu aka azụ dị ya
Ikpere ala ka nwa ehi ji aṅụ ara nne ya
Ikuku kuo, ahụ ike ọkụkọ
Ikwe n'aka gafere ubu aka aghọọla ọgụ
Ikwighikwighi sị anya nwa ya na-atụ ya ụjọ
Ikwu amaghị ibe, ezi ya
Ilu bu mmanụ igbo ji eri okwu
Ire dị n'ọnụ ji nka eze eze
Ire ụtọ ka ejila ji aga n'ogwu
Isi ahụrụ kwaa okpu
Isi akwụ dara n'ala emetugo aja
Isi anaghị aka onye bu ya
Isi awọ chọwa okenye ya ahụghị ya agbaa nwata
Isi kote ebu, ọgbaa ya
Isi kote ebu, ọgbaa ya
Isi mmiri anaghị ebu ebu
Iwe dị n'obi, ọchị dị n'eze
Iwe nwanne anaghị eru n'okpụkpụ
Izu ka mma na nne ji
Jiri anya okenye ji ele ihe dị n'ime akpa lee ya
Jiri ehihie chọwa ewu ojii
Jiri ire gi gụọ eze gi ọnụ
Jiri nwayọ ka ofe rọọrọ arọ zuoro gi nri
Ka a bịa ka a bịa, mere awọ epughi ọdụ
Ka a na-aga n’ubi ka ọka na-aka
Ka a na-achụ aja ka ikpe na-ama ndị mmụọ
Ka a sị akụla ọgwụ ọ bụ ma ajụ?
Ka aha eri, anaghị eri onwe ha
Ka ahụtachaa ka mgbọ ji atụ enwe n'isi
Ka anyị na-achụ aja ka ikpe na-ama ndị mụọ
Ka arụsị na-ahana, e ji aka abụọ apa ya
Ka e letachaa ka mgbọ ji atụ enwe n'isi
Ka ejiri nwa ehi mma atụ, asị gbuo nne ya?
Ka ishi enyi si anyị ya arụ, ka nke ndanda si anyị kwa ya
Ka m bịa ka m bia mere ngwere agbaghị ajị
Ka m lawa na nwa m bịara iku anwụọla
Ka m tunye gị azụ, esi m oru
Ka mma dị ka esi akwa ọbọ ya
Ka na-ahọ ụkwa ka ana-ahọ ire ya
Ka onye dị ka ụka ya dị
Ka Okeke gachara army, olee boot ya?
Ka ọ dị be oke, ka ọ dị be ngwere
Kama anụ m ga-agbalarị m, m bere ya ọdụ
Kama mmiri ga-erim, ya buru okpu m
Kama rijuo afọ dachie ụzọ sị buru ọnụ
Kedụ ka mmiri si banye n'opi ụgbọgụrụ?
Kedụ uru awayị tara mmiri?
Kpara akwụ kpara akwụ, e buru isi ya, ọ bụrụ oshi
Kulie ka m zaa ụlọ bụ ọchụchụ
Kupu mmiri nọ n'ikpere tupu o rue ubu aka
Kwọọ mmiri mgbe ọ ka dị na mgbụgba ọla
M gwara nwunye di m na afọ na-asa m, ọ sị m pụta mgba
M taa na-abụ ya n'obi, ọ taa na-abụ m n'anya
Maka adịkwa ama ama Onịcha gwara Obosi
Mba amaghị onye ukwu
Mbajị na-akarị ịhụ n'ọkụ
Mbe adịghị akọ n'ilu
Mbe danyere n'olulu, nọọ abalị atọ, o ruo n'abali nke anọ, ọ sị ndị bịara iweputa ya, meeya ọsịịsọ na nshị eshigbuela ya
Mbe sị na agha daa ọ zọgbuo nwaanyị dị ime, aghaa daa ndị nwere ụkwụ azọgbuo nwaanyị dị ime, abịa kpụrụ mbe
Mbe sị na ejighi ehi kwaa nna ya dị na nso, mana a sị ya weta na ya enweghị
Mbe sị onye ekotaghị, ọgọdọ ya ekotara ya
Mbe sị onye rahụwa ụra ya tinye ngajị n'akpa adịghị ama ama nri gbaa na nrọ
Mberede nyịrị dike, mana mberede ka eji ama dike
Mgbada dara ibi, bụ uru dinta
Mgbada sị kama isi ya ga agbọ n'ite, ka ikwukwe ọsọ kwee ya
Mgbe mbe lọrọ afọ ukpo
Mgbe mmadụ kwara mmadụ ka ọ kwara onwe ya
Mgbe ọ na-ara ahụ ka ọ na-ebi
Mgbe onye jiri teta ụra bụ ụtụtụ ya
Mkpa akwụkwọ ka dibịa ji aka ibe ya
Mkpi si na ije mba amaka, na ọ bụ na njem ya ka ya mụtụra ibili ọnụ elu
Mkpi puru mpi maka na nne ya puru mpi, ebula mere nke ya nsata
Mkpi puru mpi maka na nne ya puru mpi, ebula ṅutara nke ya aṅuta
Mma abụọ dị na nke ụbiam, nke di nkọ enweghị isi, nke nwere isi adịghị nkọ
Mmadụ anaghị abụ ogbenye bụrụ amụsụ
Mmadụ anaghị adị isi ka ihe akọrọ ya n'ọnụ
Mmadụ anaghị aghọtacha ihe ụkpaka ya mịrị
Mmadụ anaghị anọ na mmiri ncha abaa ya anya
Mmadụ anaghị egbu onye ọ ga-ebe
Mmakwara anaghị ebu ụzọ
Mmanwụ daa ogwugwu mma ya arụọ
Mmanya hụ onye ọ ma, o bee ugwu
Mmebụ ọgaranya ka ogbugbu ya
Mmecha ede abụghị ọkụkọ ya
Mmiri dọrọ na eju dọọrọ nwa nkịta
Mmiri maa akpa, akpọ ya akpa agwụ
Mmiri machie ụkwụ a zọrọ azọ, ọ gaghị amachi okwu ekwuru n'ọnụ
Mmiri mara ugo sara ugo ahụ
Mmiri na-enyere ncha aka agba ụfụfụ
Mmiri riri enyi ka mbe huru na awa ọgọdọ, ọ ga-efe efe ka ọ ga-awụ awụ?
Mmiri ugo jiri kwọọ aka ka ugbala jiri saa ahụ
Mmụọ kpara nwata ọ gbagbuo ele, ga enyere ya aka ọ maburu ya
Mmụọ ndị na-efe na-egbu ha
Na ntụtụ ụkwa ka e ji ama onye ụbụ nri
N'afọ n'afọ ka nwata na-asa ahụ
Ndidi bu ije ụwa
Ndụ mmiri, ndụ azụ
Ngagharị ka e ji ere nwa mkpi
Ngakọ meeting na-ebuta ụbụ rice
Ngala kpuchie ute, agụọ ekpughee ya
Nganga ka okenye ji agbara ehi ọsọ
Ngwere hapụ ukwu osisi, aka akpara ya
Ngwere niile makpu amakpu anyị amaghị nke afọ na-arụ
Ngwere rịrị ọjị abụzighi nwa
Ngwere sị na-elu daa, si enweghi onye toro ya, ya too onye ya
Ngwugwu a ga-atọpe atọpe, ịwa ya aka bụ ịza
Nkakwụ na-ezo ka udele ghara ibu ya, udele o kwuru na ya na-ebu nkakwụ
Nke onye chiri ya zere
Nke onye ji ka o ji ana aka
Nke onye riri ka o bu
Nkịta na-aza oku abụo ofu mgbe, na-etiwakwa agba
Nkịta nile na-eri nshi, ka ma ọ bụ nke ahụrụ nshi n'ọnụ bụ ori nshi
Nkịta nyara akpa, nshi gwụ n'ọhia
Nkịta richaa nshi, eze ree ewu
Nkịta sị ndi nwere ọdụ amaghi anọdi ọdụ
Nkịta sị ya ma ihe ya ji eso onye afọ ukwu, ọ nyụghị anyụ, ọ gbọọ agbọọ
Nkịta anaghị ata ọkpụkpọ a nyawara ya n'olu
Nkụ dị na mba na-eghere mba nri
Nkụ onye kpara n’ọkọchị ka ọ na-anya n’udu mmiri
Nkume laa elu, ụjọ tụwa ite mmiri
Nkwa ofeke kwere mmadụ dịka nkwa ekwere nwaanyị n'elu akwa
Nne ewu na-ata akụgbara, ụmụ ya ana-ele ya anya n'ọnụ
Nnukwu azụ kpata nnukwu nkụ, obere azụ kpata obere nkụ
Nnukwu mmanwụ nọkaria n'ọgbọ obere nwaanyi amara ọrụ ọ gbara
Nnụnụ benyere n'ọdụ igu na-achọ egwu ọ ga-agba
Nnụnụ fepuru n'ala fenye n'okpokikuwe ka nọkwa n'ala
Nnụnụ isi akaghị aka anaghị eje akwa ọtụrụkpọkpọ
Nnụnụ isi na-akaghị aka anaghị aga ọgụ ọtụrụkpokpo
Nnụnụ ufe si kamgbe dinta mụtara igba ehieghi aka, yanwa amụta ife ebeghi ebe
Nnụnụ tụọ nkwe a mara n’osisi ọ ga-ebe
Nnwa ga-egburu nna ya ehi, a na-ama ya n'agaramije ụkwụ ya
Nnwa maara nna ya amarago ndị ichie
Nnwa mbụ ejeghi ije, ọ bụ nke abụọ ga-agba ọsọ?
N'obodo otu na-adịghị, mbele na-abụ eze
Nri akụkụtara na nkọnkọ ite na-ala na nkọnkọ ọnụ
Nri bọrọ ọra abụghịzi ofu onye nwe
Nshi a na-echetera arụ taa
Nshị anaghị agba aka apụta, o jighi ahụrụ, o jiri mamiri
Nshịkọ sị egwuruegwu rue nke ịchịfe aka azụ, onye egwusala ya
Nshịkọ sị na ya gwuru iyi ukwu, gwuo iyi nta, ma daa mmiri n'ite ofe nwaanyị
Nshịkọ sị ọgọ ya na chi ya yọrọ ya ọrụ ofu mgbe, ya were buru isi abụọ
Ntị ga-anụ ihe abụghị ma ọ ha ka okpu ata
Ntukwu buru mgba, awọ ga-abụ azụ eru ala
Ntukwu na-agụ ngwere ma ọdụ ekweghi ya
Nwa agụ anaghị ata ahịhịa
Nwa anaghị ebu nna ya ụzọ amụta di ọkpara
Nwa anwụ na-agọ, nwa ebu na-agọ, onye zi gbakpọrọ nwa atanị anya?
Nwa atụrụ na-achọ ipu mpi, ekwu ga-esi ya ike
Nwa atụrụ na-achọ ipu mpi, ya jụkwa ebila ka ekwu dị ya
Nwa ehi hulọta ala ọṅụrụ nne ya ara
Nwa mgbada gbajiri ụkwụ ya n'egwu tupu oge eji agba egwu eruo
Nwa mkpi lechara anya gbaa nne ya
Nwa mmụọ emegbula nwa mmadụ, nwa mmadụ emegbula nwa mmụọ
Nwa nkịta erighi ụna, ya anyara ọkụ
Nwa nne dị na mba
Nwa nnụnụ na-agba egwu n'akwa nduru, nwere ihe na-akụrụ ya egwu n'ime ọhịa
Nwa nza ga-agba ụbara oke ike ya ha
Nwa nza rijuo afọ, ọ sị chi ya pụta mgba
Nwaanyị anaghị eji na nwunye di ya kwere ya ekele ofuma were kpowa ya ọgọ
Nwaanyị buru ibe ya ụzọ gaa di na-aka ya enwe kanka eku na nkanka ọkụ
Nwaanyị chọwa nwunye di ya okwu, o sị ya nye ya mmanụ ka o were taa akwụ
Nwaanyị ike ukwu ga-ama ibu chi ya bunyere ya ma ọsọ suru
Nwaanyị lụrụ dị naabụ, ọ mara nke ka mma
Nwaanyị na-ama ụkwa na ọrụ na-eme
Nwaanyị na-amụ nwa na-eti mkpu bu ụmụagbọbia ka ọ na-eyi egwu
Nwaanyị na-ere ogiri ma ijiji anya pịara
Nwaanyị olu oma, di anaghị ajuru ya nri
Nwanne dị na mba
Nwata akpakarịrị n'nkụ sị ibe ya kpara n'ajọ ohịa
Nwata kpakarịa ibe ya n'nkụ asị na-ọkpara n'ajọ ohịa
Nwata a kwọ n'azụ amaghị na ije dị anya
Nwata a kwọ n'azụ amaghị na ije dị ụfụ
Nwata a kwọ n'azụ amaghị na ije na-ara ahụ
Nwata bulie nna ya elu, ọgọdọ awuchie ya anya
Nwata buru ọkụ jide mma, ọkụ ereghi ya mma eyie ya
Nwata chọọ ịgba ama ọ sị nne ya na ihe na-eme
Nwata ero gburu nne ya, gbuo nna ya, ya ka na-achọ ero, ji aka ya egwu ala ili ya
Nwata erughi etoghi eto wara ogodo, ikuku kue o buru ya buru ogodo
Nwata etoghi eto chọwa ihe gburu nna ya, ihe gburu nna ya egbuo ya
Nwata etoghị eto wara ọgọdọ, ikuku eburu ya bụrụ ọgọdọ
Nwata gaa n'ụlọ ahụghị nwata ibe ya, ọ sị enweghi onye nọ n'ụlọ ahụ
Nwata gbere igbe tụọ mụ mbọ m gbere igbe tụgwara ya, adịghị ama ama, o nwee ihe ala ziri ya
Nwata gotere akpa ọhụrụ na-anya ya were alaba ụra
Nwata gwa m ebe ọ na-aga, m gwa ya ihe ọ ga-ekwu
Nwata hụ onye mkpụmkpụ, ọ di ya ka ọ hụrụ ebiri ya
Nwata hụwaa anya, o kwụwaa ọnụ
Nwata jide ọkụ jide mma, ọkụ ereghi ya, mma eghe ya
Nwata kwegburu ewi n'ọnya amaghị na igwu ala na ara ahụ
Nwata kwọchaa aka o soro ndi okenye rie nri
Nwata kwuwaa ọnụ ọ sị na ya agwagbụe okenye n'okwu
Nwata lụọ ọgụ egboro egbo ọ sị ọgụ nke a atọgbuo onwe ya
Nwata na-agba okenye nso, ya ataghị ọjị ya taa ose
Nwata na-ahụbeghi nne ya sị ahịa agbasabeghi
Nwata na-amụ elu nne ya na-amụ akwa
Nwata na-amụ iri elu, obi ga-esi ya ike
Nwata na-ata akara na ata ego ya
Nwata na-eto, ntị ya ana-asa
Nwata onye ara gburu nna ya, ọ hụ mechanic ọ na-agba
Nwata rie awọ ọ jụ anụ
Nwata rie ihe ọ na amụrụ anya ọ rahụo ụra
Nwata sị na nne ya agaghị arahụ ụra, agaghị arahụ ụra
Nwata tụọ ilu nna ya tụrụ, ya kwụọkwa ụgwọ nna ya ji
Nwata sị sue agbara ọkụ, ya agbakwala ọsọ
Nwata ụkwụ nga nga na-aka okenye isi awọ ihe ama
Nwayo nwayo ga eji aracha ofe ji oke
Nwayọ nwayọ ka eji aracha ofe dị ọkụ
Nwoke anaghị anọ be ya nọpịa mkpụrụ amụ
Nwoke lụchaa ọgụ, nwaanyị enwere akụkọ
Nwoke nwaanyị na-afụrụ ọja, na-awụ mgbala ndị mmụọ
Nwoke tochaa, o chere ibe ya
Nwunye awọ sị na di atọka ụtọ, ya jiri lụta nke ya kwọrọ ya n'azụ
Ọ bịara be onye abịagbula ya, ọ lawa, mkpumkpu akwọkwala ya n'azụ
Ọ bịara ije nwe ụla
Ọ bụ a zọta ala a zọwa ute
Ọ bụ anụ ji eze ari elu na-ama osisi na-elu ilu
Ọ bụ chi onye na-efe na egbu ya
Ọ bụ eburu ụzọ achụpụ ufu, tupu atawa ọkụkọ ụta ịba n'ọhịa
Ọ bụ ihe onye nwere na-epu n'ubi ya
Ọ bụ isi a hụrụ kwaa okpu
Ọ bụ itakọ ụkwa na-ebute ịjakọ eze
Ọ bụ ka ọsa hụrụ akwụ si edebe eze
Ọ bụ m ka Aba na-amụrụ ọkpụ?
Ọ bụ naanị osisi nụrụ na-aga egbu ya kwụrụ
Ọ bụ nwaanyị na-eshi ogiri ma ijiji anya kpọrọ
Ọ bụ ofu nne na-amụ mana ọ bụghị ofu chi na-eke
Ọ bụ oke nọ na ụlọ gwara nke nọ na ọhịa na azụ dị na ngiga
Ọ bụ otu aka ha nwaanyi ka ọ na-atukwasị di ya
Ọ bụ ọma nkịta na-amanye ya aka n'ọnụ
Ọ bụ onye nọ mmadu nso na anụ ishi eze
Ọ bụ ụkwụ a ka nama ji ga-eru Umuahia
Ọ bụghị a hụchaa ozu ele, a na-achọ nzọ ụkwụ ya
Ọ bụghị egwu achị ụtaba n'aka agba
Ọ bụghị ka aki ilụ na-ada n'ọnụ ka ọ na-atọ
Ọ bụghị ka ihe nracha sị amị
Ọ bụghị ụbochị nwata kwafuru mmanụ ka a na-eti ya ihe, kama ọ bụ ụbọchị ọkwafuru ogiri akwụ
Ọ bụrụ na agwaghị onye isi aha onye nwụrụnụ ya bee akwa onye dị ndụ
Ọ bụrụ na dibịa rijuo afọ, ọ gaa n’ajọ ọhịa ga bụta mgbọrọgwụ
Ọ bụrụ na ịnyụ mamịrị efeka, ka ọkụkọ nyụọ
Ọ bụrụ na mmehie adịghị mgbaghara agaghị adị
O buru nnaya ụzọ mmụọ di ọkpara
Ọ bụzị Aaron gbara aka laa
Ọ chọ ihe kụọ aka, maka na anụ na-akpa n'abalị erika
Ọ chọ ihe ukwu ahụla agba enyi
Ọ chọ mma jide akụ
Ọ chụ nwa ọkụkọ nwe ada, nwa ọkụkọ mwe mwe ọsọ
Ọ dị nkenke na-eme ire
Ọ dị n'ala na-ebu eke
Ọ dịghị mma a nọdị mmadụ mmadụ a na-ekwu mmụo mmụo
Ọ ga-ama na mmiri ọku na-egbu mbe
Ọ gbajuona dọrọ
O gbu opi na-ehicha ọnụ
O gbuo n’ọhịa ọ pụta n’ụzo na-ajụ onye gburunụ
O ji akwa asa ahụ, mara onwe ya
O ji ji nwata egburu ya awayị
O ji m eme ọnụ, ihe m ji emere ya ọjị akọkwala m
O ji mma, jiri ibe ji, onye ọ wanyere ya rie
O ji nwayọọ adịghị emerụ ahụ
O ji ọfọ ga-ala
O ji ụka ama atụ sị na etito toro ọkụkọ n'isi ha otu a, isi ọkụkọ ọ hazị aghaa?
O jirila eze kpee ekwere
O jirinụ anya ya hụ nti ya
O kweghi m ṅụrụ mmiri tọwa iko
Ọ maghi onye nwụrụ a na-ebe
Ọ mara ajụ bidoro aka n'ụkwụ ụgbọgụrụ na-ajụ ihe na-ami anyụ
Ọ mara asụ, ya sụọ n'ikwe, ọ maghị asụ ya sụọ n'ala
O mewere ma chi ekweghi, onye ụta atagbụla ya
Ọ kwara ihe eghu na-ata
Ọ na-abụ a hụchaa ụzọ a si mụta ọkụ?
Ọ na-agbaghachị aka clock azụ
Ọ na-akọ oghere ji egheghi ede
Ọ na-eme ka nkịta nwaanyị zụrụ
Ọ naghị ada ebe a ga-atụtụta ya
Ọ nọ na ndụ hụ onwa
Ọ nọ n'ala mara ụsụ dị ime
Ọ nọ n'okụ ma ụgụrụ apụta
Ọ nụrụ ube nwanne agbala ọsọ
O tere ofe nwa atụrụ ji rawa agba
Obere nwa na-amụ iri elu, obi ga-esi ya ike
Ọchanja dị out a kedụ ka main market ga adị?
Ọchị abụghị ụtọ
Ochie dibịa chụa aja ọ dịka e weere ya nye ndị mmụọ n’aka
Ọchụ nwa ọkụkọ nwe ada, nwa ọkụkọ nwe mwemwe ọsọ
Ọdụ ghara ikwe, ọsụọ n'ala
Ofe di mma bụ ego gburu ya
Ofeke amaghị na nwanne ya bụ ọbịa
Ofeke amaghị mgbe e kere nkụ ụkwa
Ofeke amaghị oge e kere nkụ ụkwa
Ofeke mụta atụta atụ, atụ gwụ n'ọhịa
Ofeke na-eji aka ekpe arụ ụlọ nna aka
Ofeke sị kama mmanya ga adọ n'ite, ya dọrọ n'afọ
Ọfọ a na-ejiri ede bụ isita ya mmiri
Ọfọ ka idide ji awa ala
Ọfọ nfọju akpa, akpa ya na eghe oghe
Ofu aka anaghị eke ngwugwu
Ofu anya ji ishi ụgwọ
Ofu mkpụrụ aka rụta mmanụ, o zue ndi ọzọ
Ofu mkpụrụ akwụ anaghị efu n'ọkụ
Ọganọhịa amaghị na akwụkwọ kwụ ntị
Ogazị amaka mana ejighi ya agọ mmụọ
Ogbenye adịghị arọ nrọ osikapa
Ogbu mma anaghị ekwe ka mma gaa ya n'azụ
Ogbu ọja na-ehicha ọnụ
Ọgọ onye bụ chi ya
Ogoli amaghị mma, onwee ezi agwa
Ogoli kawa ọ dị ka ejighị akụ lụ ya
Ogoli mara obi dị  ya ọdịka ọhụrụ ọ dịka ọ gara na chukwu
Ogologo abụghị na nwa m etoola
Ogologo okwuchukwu adịghị n'ụka mgbede
Ogwumagala sị na ihe ya na ụwa jiri dịrị na mma, bụ na o weta ocha ya achaa, o nwete oji ya ejie
Ogwumagala sị na ya agaghị eji maka na ọku n'agba n'ịkpa we chefuo ije ọgaranya nna ya kuziere ya
Ọhịa na-asọ nkata ya epula ero
Ọhịa wọrọ gi nkụ, zeere gi olu
Ohu hụrụ ebe e ji mbazụ eli ohu ibe ya, mara na otu ahụ ka ụbọchị nke ya ga-adị
Oje mba enwe iro
Oji akwa aghụ ahụ mara onwe ya
Oji akụ kwaa nna ya, ọ bụghị ọkpara gburu ya
Oji ọfọ ga-ala
Oji ọsọ agbakwu ọgụ amaghi na ọgụ bu ọnwụ
Ọjị rue ụlọ o kwue ebe osi
Oji ụkwụ ya eje sị ụmụ di ya hụrụ ya n'anya
Oke akpachala anya taa akpa dibịa ma dibịa akpachala anya bụọ oke ọnụ
Oke anaghị eri ihe onye mụ anya
Oke amaghị ama taa akpa dibịa, dibịa amaghị ama kpaa oke eze
Oke echiche mere atụrụ enweghi mpi
Oke nkịta sị ihe ya ji anyụ mamiri ewela ụkwụ elu bụ ka onye ọbụla hụ na ibi adaghị ya
Oke nkwụkwụ ekweghi nwanyị gba ahụ ọnụ
Oke n'ọhịa ngwere n'ụzọ
Oke osisi daa, ụmụ nnụnụ eju ọhịa
Oke sooro ngwere maa mmiri, ọ kọchaa ngwere, ọ ga-akochakwa oke?
Okenye anaghị agwo ofe
Okenye anaghị anọ n’ụlọ ewu mụọ n’ọgbụ
Okenye anaghị asị nwata kuliere ya n'oche, nne nwata akpọghị ya, nna ya akpọọ ya
Okenye ji abalị eri oke, ma mmadụ ahụghị ya mmụọ hụrụ ya
Okenye jide ọjị kwachaa akpịrị, ndị mmụọ ṅawa ntị
Okenye kwachaa akpịrị, ntị ekelie ndị mmụọ
Okenye nwere anya abụọ mana nke atọ ka o ji ahụ ụzọ
Okenye nyụọ ahụrụ asị na ọ na-etiri ndi mmụọ akị
Okeọkpa kwaa, onye ụgwọ eche gbue onye ya
Okirikiriri ka a na-agba ukwu ose anaghị arị ya elu
Okokporo anaghị ama mgbe ọ gafere n'ama ọgọ ya
Okokporo chiwe nkwụ, siwe ite, nkwụ agbafughi, nri dị n'ite eree ọkụ
Okokporo na-afụ ọkụ na-ama ọsụ, amara na ịlụ nwaanyị eruala
Okokporo sị ahịa ejughi eju taata, mmadụ ole nọ n'ụlọ ya
Okokporo sịrị chọọrọ ya nwaanyị taata, chọọrọ ya nwaanyị echi, ọ bụ ya na onye bi bu?
Okokporo sọrọ ntụ ụtụtụ pụọ, ọ lọta ntụ na-eche ya
Okoro emeghi ka onye ara, ụmụnna ya agaghị alụnye ya nwaanyị
Okoro sị ya na-achọ nwaanyị ma ọ bụghị nke dị ime
Ọkpa akụ eri eri lekwanụ ka ọnụ dị ndị nwụrụ anwụ
Ọkpa ka e ji achọ ihe danyere na mmiri
Ọkpụkpụ nkịta na-atalịghị ka ọkụkọ sị nye ya ka ya tapịa
Ọkpụkpụ nyịrị nkịta ịta ka ọkụkọ sị nye ya ka ya tapịa
Ọkụ a gụnyere nwata anaghị ere ya
Ọkụ anaghị asa mmiri agbagbu nwa awọ
Ọkụ anaghị efe mmiri egbu awọ
Ọkụ daa ibube, ọdị ka ọnyụrụ anyụ
Ọkụkọ anaghị echefu onye foro ya ọdụ na udu mmiri
Ọkụkọ anaghị eji ụkwụ abụọ abọ ihe
Ọkụkọ chị ụmụ anaghị arahụ n'elu
Ọkụkọ dị be onye ụbịam na-eri nsi ewu
Ọkụkọ gaa ebe ọ na-amaghị ala, o jiri ofu ụkwụ kwụrụ
Ọkụkọ hapụrụ mma gburu ya na-ọrọgọrọ ite olu
Ọkụkọ kwụsị kwọm kwọm, o jiri gịnị zụo ụmụ?
Ọkụkọ lakpụrụ ụra abụghi n'afọ jụrụ ya
Ọkụkọ mmanya na-egbu ahụbeghi ufu ara na-aghọ
Ọkụkọ na-abọpụta mma na-egbu ya
Ọkụkọ ntị ike na-anụ ihe n'ite ofe
Ọkụkọ nyụọ ahụrụ, ala jụwa ya ọsọ
Ọkụkọ ruo ebe ọ na-amaghị, o jiri ofu ụkwụ kwụrụ
Ọkụkọ sị akụọ ekwe ọjị na ya agaghị ege ntị maka na ya enweghi eze
Ọkụkọ sị ihe mere ya jiri mara na ya bụ eze, bụ na ana-ebu ya n'isi aba obodo
Ọkụkọ sị ihe ya ji anụ mmiri eleli anya elu bụ maka ihe na-egbu ya na esi n'elu
Ọkụkọ sị na ya ga atụgbu tupu ya eloo
Ọkụkọ sị, ya na-ebe abụghị ka ihe ji ya hapụ ya, kama ọ bụ ka elu na ala nụrụ olu ya
Ọkụkọ tụhie ala, olu agọọ ya
Ọkwa sịrị ụmụ ya ha tụrụ ji ha tụrụkwa mgbọrọgwụ, maka onye nwe ji gwuru ji ya ka ha were mgbọrọgwụ biri
Ọkwọ m n'azụ ụkwụ m na-akpụ n'ala, ya kwọtuo m
Okwu a na-asọ anya anaghị ebi gboo
Okwu dị kwụrụ kwụrụ, e dewe ọnu kwụrụ kwụrụ
Okwu e kpebiri na-awaghị ọjị, echi a ga ekwugharị ya
Okwukwe ka nwa ewu ji amago nne ya
Ọkwụrụ anaghị aka onye kụrụ ya ogologo
Olee uru awaị tara mmiri?
Ọnu eji biri akụ abụghị ọnụ eji akwụ ya
O nwee imi ọ ga akpọ anwụrụ
Onweghi ebe i ji-azụ aga
Onweghi ihe agwọrọ onye ara gwọta ya ntakwu
Onweghi ihe anya hụrụ gbaa ọbara
Onweghi ihe anya hụrụ gbaa ọbara
Onweghi onye ga-asi ofe nne ya tere adịghị ụtọ
Onweghi onye ma obi onye eji n'ala, a hapụ ya ọ ga-alụ ọgụ ka ọ ga-agba ọsọ
Onweghi uzo e si gawa Onicha ọ di nsọ
Onwekwara egwu ezi na-agaghị agba?
Onwere ihe di iche egbe na egbe
Onwere ihe mere ede jiri bee nwịị
Ọnwụ egbuchughi utu, o rie ihe kere isi
Ọnwụ ga-egbu nwa nkịta anaghị ekwe ya nụ usi nshị
Ọnwụ gburu dike, nwete ofeke ọ dọrie ya
Ọnwụ gụwa nwa unere, ọ zaa otukwuru ọ mịa
Onye a ga-eji ehi kwa adịghị mma ịnụ na ọ bụ oke tagburu ya
Onye a ghọgburu ka a gbara
Onye a jụrụ anaghị ajụ onwe ya
Onye a kọrọ ọnụ bụ chi ya ka akọrọ
Onye a na-achụ ehi na-akpọku, ma o jighi ọgbụ ya, o jiri ọgwụ ya
Onye a na-agbara ama ọ na-aṅụrị, onye zuru oshi okwetela?
Onye a na-agwọ ibi ya na-eto afọ, ndị mmụọ na-akpọ ya oku n'ajọ ọhịa
Onye a na-akpọ nwere ihe ọ na-eme
Onye a na-akpọghị oku zogbue nwa ọkụkọ, o kwue onye kpọrọ ya nụ
Onye a na-azọ na-azọ onwe ya
Onye a na-ekiri ekiri adịghị mma ite ntụ ihu
Onye a sị jide ka o ji, ya mara na nke o ji amaka
Onye a tụọrọ ilu kọwaara ya, ego e ji lụ nne ya lara n'iyi
Onye afọ na-asa amaghị ajọ ohịa
Onye aghụghọ lie onwe ya, ofu aka ya na-apụta
Onye aghụghọ nwụọ, onye aghụghọ e lie ya
Onye ajụjụ anaghị efu ụzọ
Onye anọghi ebe a liri ozu na-esi n'ukwu abọ
Onye aṅụ gbara na-atụ okporokporo ijiji ụjọ
Onye aṅụla ngwọ na nkwụ na-abia
Onye anwụla ibe ya e fụla
Onye ara sị onweghị ihe ya ga-agwa onye ji mma aga ya n'azụ, tutu rue mgbe ya chọrọ ishi ya achọ
Onye ara sị ya ma ihe ya na-eme, mana ihe na-eme ya ka ya na-amaghị
Onye arịrịọ ka onye oshi mma (Onye ayịyọ ka onye ori mma)
Onye bi na agiga oshimiri anaghi eji asụ akwọ aka
Onye biliri ọtọ nwere ebe ọ na-aga
Onye biri ibe ya biri
Onye bu enyi n'isi anaghi eji ọkpa akpa nte
Onye bu igu ka ewu na-eso
Onye buru chi ya ụzọ ọ gbagbuo onwe ya n'ọsọ
Onye chi ọjọọ gaa nkụ n'ọkọchị, mmiri na-asa ya ahụ
Onye chi ọjọọ, mmiri na-afanye ya n’eze
Onye chị ọkụ aracha aka, ọ ga-ekonye ya n'uko
Onye chọrọ ịgba ọsọ sị na-arọrọ ya anya
Onye chụọ onwe ya na ụgbọ, o sị ụgbọ ghara ya
Onye dinyere nwata nwude nkapia (nkakwụ), ga-ekunye ya mmiri o ji ga-akwọ aka
Onye emere ka emere ibe ya obi a dị ya mma
Onye emetụkwala nwa agụ aka n'ọdụ, ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ
Onye enyi ya nwaanyị sị ya ga-abịa na-anụ nzọ ukwu ndị mmụọ
Onye ga elo mkpụrụ ụdara marakwa ka ike ya ha
Onye ga-eri awọ, ya rie nke mara abụba, ka ọ ga-abụ akpọọ ya ori awọ ya za
Onye gara be awọ sị bunye ya oche, ọ jụkwara nke awọ nọ na ya
Onye gbakaa ute ya, o dina n'ala
Onye gburu dibịa na agwọrọ ya ogwụ, ndị na-eme ya nshi ọnwụchala?
Onye gbuwe achara onye gbuwe onye akpọla ibe ya onye ikoli
Onye gotere egbe ọhụrụ na-aga mgbaru n'ụlo akwa onye afo toro
Onye hụrụ ebe ọkụkọ na-abọ nshị, ya chụpụ ya, maka amaghị onye ga-ata ọkpa ya
Onye ị zụrụ tooro onwe ya
Onye ji ihe nwata welie aka elu, aka gbuwe ya mgbu, o wetuo ya
Onye ji mmadụ na ala ji onwe ya
Onye jiri enyi kwe onya, ọ chọrọ imata gịnị?
Onye ka mmadụ ka chi ya
Onye kpata nkụ ahụhụ ngwere biara ya ọrịrị
Onye kpọọ nkata ya nkịrịka, agbatobia ewere ya kpoo ahịhịa
Onye kpọọ ọba ya nkpọkọrọ,ụmụaka ewere ya kpoo ntụ
Onye kwe n'ihe otu kwuru, a laa n'oge
Onye kwe, chi ya ekwe
Onye kwụo ụgwo o ji o nwere onye ya
Onye kwuru ọtọ gwujie ji, o tukwuru ala gwupụta ọdụ ya
Onye lewe ozu anya n'ihu o begbue onwe ya n'akwa
Onye lobie ụwa ya bo chi ya
Onye mara asụ, ya sụọ n'ikwe, onye amaghị asụ, ya sụọ n'ala
Onye mee ka oke, buusu chụọ ya ọsọ
Onye mgbọ tụpuru nna ya isi na eji ite ọla eme okpu
Onye mụ na ya so achụ mgbada, si ụkwụ di ka ụkwụ ele
Onye na-aba mba eti aka n'obi na-egosi ndi mmụọ ebe ndụ ya di
Onye na-amaghị ebe mmiri bidoro mawa ya, anaghị ama ebe o zere ya
Onye na-amaghị ihe e mere were nwete enyi nwaanyị na-asi "gwa ya okwu ọ laa"
Onye na-amaghị mmadu na-akpọ ya onye a
Onye na-amaghị ọria enwe rịarịa, ya lee anya atani jiri fụrụ ya ọkụ
Onye na-anoghị n'akụkụ ọku, ji ya anaghi eghe ngwa ngwa
Onye na-anoghị ya mgbe eliri ozu na-esi n'ụkwụ abọ ya
Onye na-arachaghị onụ ya, ụgụrụ arachaara ya
Onye na-egboro ndị mmụọ ọgu, isi ya na-abụ aja aja
Onye na-ejighi akụ o jide ire oma
Onye na-ekoteghi, ọgọdọ ya ekotere ya
Onye na-ekwughi ka ọha, e bufee ya ama nna ya
Onye na-emeghị ka onye ara, ụmụnna ya agaghị alụnye ya nwaanyị
Onye na-esiri onye ishi nri na-egbu mkpọrọhihi ma o siwe
Onye na-eti aka n’obi, na-egosi ndị mmụo ebe ndụ ya dị
Onye ndị iro gbara gburugburu na-eche ndụ ya nche mgbe niile
Onye ndidi na-eri azụ ukpo
Onye njem ka onye isi awọ mma
Onye nna ya dinyere ohi na-eji ukwu agbawa mgbo
Onye nọ mmadụ nsụ na-anụ ushi eze ya
Onye nọrọ be ya, ọ na-aba
Onye nọrọ ebe ọnọ, ebe ọ na-anọghị ana-agụ ya
Onye nwanne ya bi n'alaeze anaghị aga okụ mmụọ
Onye nwanne ya na-amaghị agba egwu na-akọ ụkọ nku anya
Onye nwe ozu na-ebu ya n'isi
Onye nwere efe na-ayọ okuko akpụ
Onye nwere enyi nwaanyị see ya photo mee ya enlarge, ọ lụzie nwaanyị ọ ga akpụ ya akpụ
Onye nwere mmadụ ka onye nwere ego
Onye nwere onye ịgba anaghị eti aka n'afọ
Onye nzuzu amaghị na ada nne ya bu obịa
Onye ọ ka agụ na-aka ejido aka n'ọkụ
Onye ọ na-adi mma iri anụ motor kụgburu, anaghị ekwe ka anụ ya pụọ na iro korota
Onye ọbụla ji ọfọ mana ọfọ ma onye ji ya
Onye ọsọ chụkatara o gbalaa ikwunne ya, agbachaala ihe niile ọ ga-agba n’ọsọ
Onye obi ọkụ na ebu onye arụrụ ala ụzọ anwụ
Onye otu anya na-abụ eze n'ala ndị ishi
Onye rere nkịta ya goro enwe, ihe ntukwu ka nọkwa n’ụlọ ya
Onye rịrị ọjị, kparachaa nkụ, maka anaghi arị ọjị ugboro abụọ
Onye rụọ ala, ala jụwa ya ọsọ
Onye sị na ihe na-atọ ụtọ, okwue ihe ọ na-atọ ka ya
Onye sị ya anaghị eri oke, ejila eze ekere ya ụmụaka
Onye taa m arụ n'ishi  asọghị ntutu, m taa ya n'ike asọghị nshi
Onye tara mkpụrụ amụ ebila ji ibi ụgwọ
Onye teta ura ọkụkọ chụwa ọsọ ya gbawa, maka ọ maghị ma ọkụkọ o puru eze n'abalị
Onye tịchara akị tụfue okwute, oche na ụbịam agaghịzi adị
Onye tiri akị ọkụkọ jiri gbakọọ?
Onye too eze,eze eruo ya aka
Onye tụọ ilu nna ya tụrụ ya kwụkwaa ụgwọ nna ya ji
Onye tụrụliri okwute elu n'ahia, ya chetakwa na o nwere ịda nne ya n'isi
Onye ụgwọ onwa ya na-ezuoro ya, ọ bụzi ego over time ga-ezuru ya
Onye ụjọ ọgu ka a wụrụ mmiri, ọ sị ya na-akwadobu ịsa ahụ
Onye ụlọ ya na-agba ọkụ anaghị achụ oke
Onye were ngọngọ ṅụa iyi, iyi were ngọngọ gbuo ya
Onye wetara isi ya ka e were kụwa akị oyibo, agaghị eso ata akị ahụ
Onye wetara ọjị wetara ndụ
Onye ya na ndi mmụọ na-erikọ nri na-eji ogologo ngazi
Onye zakọọ, o kpoo
Onye zuru ịgba nwanne ya, kedu ebe ọ ga akụ ya?
Oriri dị mma ma onye ozo kpọọ ya
Ọsa enwe agwụ, uze enwe akwụ, m ọgu ha abụrụ na-elu nkwụ
Ose ka e ji eri anụ ure
Osisi nọ na akwa nduru na-eri ube mma
Ọsọ ndụ anaghị agwụ ike
Ọsọ nwaanyị na-agba hapụ ara ya aka abụghị obere ọsọ
Ọtawaraiko si kama mmanya ga adọ n'ite, ya dọrọ n’afọ
Oti ọkpọ anaghị eti ogbe akwụ
Otu eze anaghị ata atụ
Otu mkpụrụ aka rụta mmanụ o zue ndị ọzọ
Otu onye anaghị aza nnamọha
Otu onye siere ọha, ọha ga-ericha, mana ọha siere otu onye, ọ gaghị erichanwu
Otu onye tụọ izu, o gbue ọchụ
Oturukpokpo sị nne ya nwụọ ya jiri ọnụ ya tụtuo osisi niile dị n'obodo ha, nne ya nwụọ etuto too ya n'ọnụ
Ozi eziri anwụrụ oku erugo eluigwe
Ozu gbaa nkịtị, e bufee ya ama nna ya
Sị kelee onye ntị chiri, elu anụghị, ala anụ
Sọ aka kere ngwugwu ma ihe di ngwugwu n'ime
Taa bụ gboo
Tiwaara m akị Nsugbe
Tụpụrụ nkịta ọkpụkpụ n'ezi, hapụrụ ya na ndị mmuọ ọgụ
Ụbọchị aka ga-akpara ezeka udele ọ kọọ onye chiri ya ọzọ
Ụbọchị amụrụ dike na mba ka amụrụ ibe ya
Ụbọchị m na-achụ nta, mgbada na-ari elu
Ụbọchị nta ka achụọ n'owere nchi
Ụbọchị onye oshi ga-akwa nna ya, ndi ihe ha furu abịa mgbaru
Uche bụ akpa onye ọbụla nya nke ya
Uche na-abịa abịa o bighi ebi
Uche onye adị ya njọ
Ụchịcha mere ihe e boro oke
Ụdara onye ishi zọtara n'ukwu
Ụdara si na ọ bụ sọsọ ya mụtara nwa a na-apịwa ọnụ?
Udele sị na mmiri na-ezo amagbuo ya, nke na-eru onye ka ọ ga ama?
Udele sị ndị okenye anwụchala ka umụazị ghara iri ya kpọọ ya nkịrịka egbe
Ufu anaghị amụ nwa ụjọ
Ụgbọgụrụ mịaram mịara nwunye di m
Ughere abụghị ọrịa, ọ bụrụ agụọ
Ugo eberela n’elu ọjị
Ugo chara acha anaghị echu echu
Ugo rie awọ, mma ya arụọ
Ụgwọ na-ama ebu, ọ naghị ere ure
Ugwu bụ nkwanye nkwanye nwaanyị ji atọ ibe ya
Ugwu mụta mgbaji ukwu, agadi nwaanyị amụta arikata akwụrụ
Ugwu nwaanyi bụ di ya
Ụjọ anaghị atụ afọ ma ya bute ụzọ
Ụka akparakpa, isi ka eji ekwe ya
Ụka bụ nka
Ụkọ kọwa anụ ọhịa ọ gaa n'ukwu osisi, ọ kọwa mmadụ, ọ gakwuru mmadụ ibe ya
Ụkpala ntị ike na-ezu ike n'afọ nnụnụ
Ụkpala okpoko gburu ntị chiri ya
Ụkpala ọkụ na-ere chere sị ya na-asụpụta mmanụ
Ụkwa a chị n'aka ọ na-agba
Ụkwa a na-eche, mkpụrụ adịghị ya
Ụkwa dara ụbọchị a na-agụ afọ, adaghị n'oge
Ụkwa dara ụbọchị oriri, adaghị n'oge
Ụkwa na-adara ndị na-amaghị esi ahụ
Ụkwa ruo oge ya ọ daa
Ụkwụ jie agụ mgbada bịara ya ụgwọ
Ụkwụ ka e ji achọ ihe danyere na mmiri
Ukwu na-ama ọgọdọ adịghị mma ịgba ọtọ
Ụkwụ na-ga wam wam, anya na-aga zam zam na-ahụ ya
Ụkwụ ọkụkọ zọrọ nwa ya anaghị egbu ya
Ụkwụ onye wetara ka eji eso ya
Ulili si onye jekata ije ya tụọ nkwa ọsọ, maka ihe ọsọ eme mee
Ụlọ anaghị ada hapụ uko
Umeala ka ome ji ji agbapu ala
Unu agbakọọla ka unu ha eri udele
Ụra anaghị emebi anya
Ụra ga-eju onye nwụrụ anwụ afọ
Ụra kwere izu abụrụla ọnwụ
Ụra tọwa ụtọ, ekwowa ya ekwowa
Urukpu anaghị anapụ anyanwụ ije
Ururu sị ọ kaara ya mma n'ọchị chịrị ọsọ ya na dinta gbara n'ime ọhịa kama isi ya ga-agbọ n'ite
Ụsụ si ya ma na ya jọrọ njọ wee jiri abalị aga
Ụta gbatara elekentịọba ya rie ọgu mkpụrụ akụ
Ụta nwata jiri gbagbuo udele bụ okenye pịara ya
Ụtara dịrị mma ofe dịrị mma, anyị nọ na oriri oriri
Ụwa bụ ahịa, onye zụchaa ya laa
Ụzụ na-amaghị akpụ ogene, ya lee egbe anya n'ọdụ
Wepụ aka enwe n’ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ
Were ire gị gụọ eze gị ọnụ
Were nwayọ ka ofe rọrọ arọ zuoro gi nri
Were ọgbụ kedo ewu na were ewu kedo n'ọgbụ, fa ncha bụ ofu ife afụ
Ya diri nwoke mma dịrịkwa nwaanyị mma
Ya wee bụrụ ụka bụrụ ilu