Agwụgwa (Igbo Riddles)

Gwa m gwa m gwa m, gwa m:
1. Agbọghọbịa ara anọ
2. Agbọghọ ọcha a na-ama ụra na ntị
3. Ama Chukwu zara anaghị eruchi ahịhịa
4. Akụ onye na-agba ya anya mmiri
5. Akwụkwọ ugiri ada n'ukwu ugiri
6. Dum na yọm
7. Ihe a nụrụ ka e gburu mana a nụghị mgbe ọ dara
8. Ihe a nụrụ ka ọ dara mana a nụghị mgbe e gburu
9. Agbọghọ toro n'afọ laa n'afọ
10. Ihe bu gị ụzọ manye aka n'ite ofe nne gị
11. Ihe bu nri gbakụta ala azụ
12. Ihe bu ụlọ ya aga njem
13. Ihe dị n'ụlọ nne gị, ọ maghị ebu ọ reghị ure
14. Ihe gba aka fere owere chịrị ụmụ lọta
15. Ihe ji ikpere gazue ubi nna gị
16. Ihe kpu okpu nọrọ n'ọhịa
17. Ihe kuuru mmiri rịa elu
18. Ihe mere eze jiri rachaa ntụ
19. Ihe mere eze jiri taa mkpụrụ nsị ewu
20. Ihe nwere nku ma ọ naghị efe efe
21. Mba na-aga njem kpudosịa ihu n'ala
22. Nwa mara mma a naghị eku n'ahụ
23. Odogwu ọzara
24. O nwere uru enweghị ọkpụkpụ
25. Osepụrụ nwata aka n'ọkụ nri
26. Oti nwata ihe n'ihu nne ya
27. Ọgba aka arị elu
28. Okorobia ọma nchiche bere imi
29. Otu ibe ji zuru ụwa ọnụ
30. Ọ bafọrọ be onye
31. Ọgaranya ukwu aja
32. Ọnọ na mba agwa mba okwu
33. Ọnọ n'elu abara ala mba
34. Tụmtụm gemgem
35. Ụmụnne abụọ bi n'otu ụlọ mana o nweghị nke na-ahụ ibe ya anya
36. Ebughị ụzọ ekpeghị azụ
37. Ụmụnne abụọ ihu obodobo ihu obodobo
38. Ihe kụrụ aka gbabaa ọhịa
39. Ihe na-adụ nwata ọdụ n'ihu nne ya
40. Ihe na-eche gị mgba n'ezi nna gị
41. Ihe kere nwata ọkpọ n'ihu nne ya
42. Gwa m osisi ọma m hụrụ n'ụzọ ma ọ dịghị mma m ji egbu ya
43. Nwoke gba aka wụọ ngige
44. Ịgba Chukwu kwere anaghị awa awa
45. Kpọrọkpọtọ n'obi ọgaranya
46. Ihe na-ebu ụzọ richaa ọnụ abịa riwe
47. Okoro ọcha na-eti ịgba n'ugwu
48. Okoro chị ụta na-agba ezi ezi
49. Ihe anaghị ere ure, ọ naghị esi isi
50. Agbọghọ na-eru abụ n'isi
51. Akwa Chukwu sụrụ adịghị akọ akọ
52. Ihe nwere ukwu anọ ma ọ naghị aga ije
53. Mmadụ abụọ na-aga n'ụzọ, mmiri na-ama otu ma ọ naghị ama nke ọzọ
54. Ozu liri onwe ya
55. Ihe gba aka arị elu
56. A tụghee ala a hụ mmuọ
57. Ọgaranya ukwu aja
58. Ihe buru ndị nze ụzọ were oke n'ọha
59. Ihe na-efere gị aka n'ubi nne gị
60. Odi ibu enweghi okpukpu
61. Nwaanyị ku nwa n'aka, dịrị ime, sekpụrụ nwa n'aka
62. Agbọghọ otu ntụ ime
63. Onye mụtara nwa ụwa niile na-apịwa ọnụ
64. Ihe buru gị ụzọ ruo ebe ị na-aga
65. Ude a sụrụ na mba nụ ya na mba
66. Nwa so gị were baa ọhịa ma o soghị gị pụta
67. Nwoke ọcha a na-ama ụra n’ahịa
68. Ihe na-eji ụkwụ anọ aga n’ụtụtụ, abụọ n’ehihie, atọ n’abalị
69. Ihe wuru ụlọ n’elu ma biri n’ime ala
70. Ite dọchiri ụzọ, onye pụta ọ bunye asọ
71. Ihe nọ n’ụlọ na-arahụ ụra
72. Igwe mmadụ niile ji egbu osisi

Expand the box below to see answers

1. Ikwe
2. Akpụ
3. Eluigwe
4. Ụtaba
5. Nwanne anaghị alụ nwanne ya
6. Isi akwụ na mkpụrụ ya
7. Igu nkwu
8. Ụkwa
9. Ọka
10. Eku/Ngajị
11. Ikwe
12. Mbe/Ejula
13. Nnu
14. Ede
15. Ọgụ
16. Ero
17. Akị oyibo
18. Ube
19. Ogbe ụkwa
20. Ụlọ
21. Atụrụ
22. Ọkụ
23. Akpị
24. Ji
25. Agbịsị
26. Agụụ
27. Agwọ
28. Ezi
29. Ọnwa
30. Ọnwụ
31. Awọ
32. Egbe / Ekwe
33. Egbeigwe
34. Ọsọ mgbada bụ n'ugwu
35. Akị mkpị
36. Nkịta
37. Eluigwe na ala
38. Ụkpaka
39. Agbịsị
40. Apịtị / Atụtụrụ
41. Mkpụrụ mmiri
42. Nwaanyị ọma m hụrụ n'ụzọ ma ọ dịghị ego m ji alụ ya
43. Imi
44. Afọ
45. Ọgbụrị ehi
46. Anya
47. Ide
48. Akpị
49. Ụgwọ
50. Ụdara
51. Ire
52. Oche
53. Nwaanyị dị ime
54. Ụkwara
55. Agwọ
56. Ọdụ ji tọrọ n'ime ala
57. Awọ
58. Ijiji
59. Aku jiakpụ
60. Ji
61. Ose
62. Osisi unere
63. Ụdara
64. Ụche gị
65. Egbe
66. Nsị
67. Akpụ
68. Mmadụ
69. Ji
70. Nsị
71. Mmanụ
72. Eze