'Ka' in Igbo Language

'Ka' can be used in more than one way in Igbo language.

Comparative (eg. bigger than, better than) - Adjective
Mary ka John ogolo - Mary is taller than John
Nke a ka mma - This is better
Gịnị ka Chukwu ike? - What is stronger than God?
John ka Mary ibu - John is fatter than Mary
Oroma ka ube ụtọ - Orange is sweeter than pear
Aba ka Onitsha mma - Aba is better than Onitsha
Nneka -Mother is better (Mother is supreme)
Udoka - Peace is supreme
Nduka - Life is supreme
Chika - God is supreme
Nwakego (Nwaka + ego) - Child is better than money

Like
John dị ka nna ya - John is like his father
Anya ya dị ka ọkụ - His eyes are like fire
Ọ bịara dị ka o siri kwu - He came as he said

Auxiliary Verb (not yet)
Ọ bịabeghị - He has not come
ka bịabeghị - He has not yet come
ka bịarọ - He has not yet come
ka bịanụrọ - He has not yet come

Still
Anyị ka na-eche - We are still waiting
John nwere ike ịbịa - John may come
John ka nwere ike ibia - John may still come
M ka ga-aga - I will still go

Let/May
Ka anyị kpee ekpere - Let us pray
Ka Chukwu gọzie gị - May God bless you
Ka ọ dị oge ọzọ - Let it be another time
Ka m dee ya - Let me write it

Manner
Ka m kọọrọ gị ka o siri mee - Let me tell you how it happened
Kedu ka o siri mee? - How did it happen?

Reason
O nyere m ego ka m soro ya - He gave me money to follow him (so I would)
Ya ka m jiri bịa - That is why I came

While
John bịara ka m na-eri nri - John came as/while I was eating

Question
Gịnị ka Chukwu kwuru? - What did God say?
Gịnị ka i mere? - What did you do?
Kedu ka ị dị? - How are you?

Too, Very
Ọ dịka ụtọ - It is very sweet
Ọ dịka nwayọ - He is too quiet
Ọ maka - It is very good
Ọ maka mma - It is very good
Ọ jọka - It is too bad
Ọ jọka njọ - It is too bad
O buka - It is very big
O buka ibu - It is very big
John erika nri -John eats too much
Emeka (Chiemeka, Nnaemeka, Chukwuemeka) - God has done very well
Chiamaka - God is very good
Chukwuebuka - God is great (very big)